1 Kings 12:25-29

Oyiyi ehi ọlaedo dị na Betel na Dan

25Mgbe ahụ, Jeroboam wusiri Shekem dị nʼala ugwu Ifrem ike, biri nʼebe ahụ. Nʼebe ahụ ka o si pụọ, gaa wuo obodo Peniel.
Nʼasụsụ Hibru Penuel bụ otu ọzọ e si akpọ Peniel


26Ma Jeroboam chere nʼobi ya, sị “Ugbu a, ka alaeze nwere ike laghachikwa nʼaka ụlọ Devid. 27Nʼihi na ọ bụrụ na ndị mmadụ gaa ịchụ aja nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị nke dị na Jerusalem, obi ha nwere ike laghachikwuru onyenwe ha, bụ Rehoboam eze Juda. Ha ga-egbu m, laghachikwuru eze Rehoboam.”

28Mgbe ọ natachara ndụmọdụ, eze kpụrụ ụmụ ehi ọlaedo abụọ. Ọ sịrị ndị mmadụ, “Ọ bụ oke ọrụ nye unu ịgbago Jerusalem. Leenụ chi unu, ndị Izrel, ndị sitere nʼIjipt kpọpụta unu.” 29Otu nʼime ha ka o guzobere na Betel, tinyekwa nke ọzọ na Dan.
Copyright information for IboBIU